3O nwere ọṅụ ọ ga-enye Onye pụrụ ime ihe niile ma a sị na ị bụ onye ezi omume? Uru gịnị ka ọ ga-enweta ma ọ bụrụ na ụzọ gị niile enweghị ịta ụta?
4“Chineke ọ na-abara gị mba na-ebo gị ebubo nʼihi na ị na-atụ egwu ya?
5Ọ bụ na mmebi iwu gị adịghị ukwuu? Mmehie gị o nwere ọgwụgwụ?
6Ị naara ụmụnne gị ihe ebe nʼefu; ị yipụrụ ndị mmadụ uwe ha gbawa ha ọtọ.
7I nyeghị ndị ike gwuru mmiri, i nyeghịkwa ndị agụụ na-agụ ihe oriri.