14Nʼagbanyeghị ọnụọgụgụ ụmụ ya, oke ha bụ mma agha; ụmụ ya agaghị enwe ihe oriri ga-ezuru ha.
15Ọrịa na-efe efe ga-egbu ndị ya fọrọ ndụ; ọzọ, ụmụ nwanyị ha hapụrụ nwụọ agaghị akwa akwa nʼihi ha.
16Ọ bụrụ na ọ kpakọta ọlaọcha dịka uzuzu, ma tụkọtakwa uwe dịka aja ụrọ,
17ihe ndị ọ kpakọtara bụ onye ezi omume ga-eyi ha, ndị aka ha dị ọcha ga-ekekwa ọlaọcha ya.
18Ụlọ o wuru dị ka ụlọ nla, dịkwa ka ụlọ ntu nke onye nche wuru.