20Oke egwu na-adakwasị ya dịka idee mmiri; oke ebili mmiri na-ebufu ya nʼabalị.
21Ifufe si nʼọwụwa anyanwụ na-ebufu ya, agaghị ahụkwa ya anya ọzọ; ọ na-azachapụ ya site nʼọnọdụ ya.
22Ọ na-atụfu ya na-enweghị ebere mgbe ọ na-eme ngwangwa ịgbapụ site nʼike ya.
23Ọ na-akụkọta aka ya nʼịkwa emo, were ịma ọsụ wezuga ya nʼọnọdụ ya.”