18Ụlọ o wuru dị ka ụlọ nla, dịkwa ka ụlọ ntu nke onye nche wuru.
19Ọ na-edina ala dịka ọgaranya ma ọ gaghị edinakwa dịka ọgaranya ọzọ; mgbe ọ saghere anya ya abụọ, ihe niile efuola.
20Oke egwu na-adakwasị ya dịka idee mmiri; oke ebili mmiri na-ebufu ya nʼabalị.
21Ifufe si nʼọwụwa anyanwụ na-ebufu ya, agaghị ahụkwa ya anya ọzọ; ọ na-azachapụ ya site nʼọnọdụ ya.
22Ọ na-atụfu ya na-enweghị ebere mgbe ọ na-eme ngwangwa ịgbapụ site nʼike ya.