12Ma olee ebe ka a ga-achọta amamihe? Olee kwa ebe nghọta bi?
13Mmadụ apụghị ịghọta ọnụahịa ya, agaghị achọtakwa ya nʼala ndị dị ndụ.
14Ogbu mmiri na-asị, “Ọ dịghị nʼime m,” osimiri na-asị, “Ọ dịghị nʼaka m.”
15A gaghị eji ọlaedo a nụchara nke ọma zụta ya, apụghị ịtụ ihe bụ ọnụahịa ya nʼọlaọcha.
16A gaghị eji ọlaedo nke Ọfịa zụta ya, a gaghị ejikwa nkume dara oke ọnụahịa nke ọniks maọbụ safaia zụta ya,