10Ha na-awapụta ọwa ụzọ nʼetiti nkume ahụ, anya ha na-ahụkwa akụnụba ya niile.
11Ha na-achọpụta isi mmiri niile ma meekwa ka ihe nzuzo pụta ìhè.
12Ma olee ebe ka a ga-achọta amamihe? Olee kwa ebe nghọta bi?
13Mmadụ apụghị ịghọta ọnụahịa ya, agaghị achọtakwa ya nʼala ndị dị ndụ.
14Ogbu mmiri na-asị, “Ọ dịghị nʼime m,” osimiri na-asị, “Ọ dịghị nʼaka m.”