9Ndị mmadụ na-eji aka na-etiwasị nkume ahụ na-enwu ọkụ mee ka mgbọrọgwụ ugwu ahụ pụta ìhè.
10Ha na-awapụta ọwa ụzọ nʼetiti nkume ahụ, anya ha na-ahụkwa akụnụba ya niile.
11Ha na-achọpụta isi mmiri niile ma meekwa ka ihe nzuzo pụta ìhè.
12Ma olee ebe ka a ga-achọta amamihe? Olee kwa ebe nghọta bi?
13Mmadụ apụghị ịghọta ọnụahịa ya, agaghị achọtakwa ya nʼala ndị dị ndụ.