4Ọ na-egwu olulu nʼebe dị anya site nʼebe mmadụ bi, nʼebe ụkwụ mmadụ na-adịghị eru, nʼebe ahụ dị anya site nʼebe mmadụ bi ka ha na-akwụfegharị.
5Ala ahụ e si na ya enweta nri, abụrụla ihe e ji ọkụ gbanwee nʼokpuru ya.
6Safaia bụ nkume dị oke ọnụahịa dị na nkume ya; aja ya nwekwara mkpụrụ ọlaedo.
7Ọ dịghị anụ ufe nke na-eri anụ maara ụzọ ahụ zoro ezo; anya agụ nkwọ ọbụla ahụtụbeghị ya.
8Anụ ọhịa dị nganga anaghị azọnye ụkwụ nʼelu ya, ọdụm ọbụla adịghị awagharị nʼebe ahụ.