6Safaia bụ nkume dị oke ọnụahịa dị na nkume ya; aja ya nwekwara mkpụrụ ọlaedo.
7Ọ dịghị anụ ufe nke na-eri anụ maara ụzọ ahụ zoro ezo; anya agụ nkwọ ọbụla ahụtụbeghị ya.
8Anụ ọhịa dị nganga anaghị azọnye ụkwụ nʼelu ya, ọdụm ọbụla adịghị awagharị nʼebe ahụ.
9Ndị mmadụ na-eji aka na-etiwasị nkume ahụ na-enwu ọkụ mee ka mgbọrọgwụ ugwu ahụ pụta ìhè.
10Ha na-awapụta ọwa ụzọ nʼetiti nkume ahụ, anya ha na-ahụkwa akụnụba ya niile.