18“Echere m sị, ‘Aga m anwụ nʼụlọ nke aka m, na ụbọchị m ga-abakwa ụba dịka aja dị nʼala.
19Mgbọrọgwụ m ga-eto rịda na mmiri, na igirigi ga-adakwasịkwa nʼalaka m abalị niile.
20Nsọpụrụ m ga-adịgide ọhụrụ nʼime m, ụta m ga-adịgidekwa ọhụrụ nʼaka m.’
21“Ụmụ mmadụ na-eji oke olileanya na-ege m ntị, ha na-ederekwa duu ịnụrụ ndụmọdụ m.
22Mgbe m kwụsịrị okwu, ha anaghị ekwukwa ọzọ. Okwu m na-ada juu na ntị ha.