15mụ na ụmụ ndị ikom eze, ndị nwere ọlaedo, ndị jikwa ọlaọcha kpojuo ụlọ ha.
16Ọ bụ gịnị mere e zofughị m nʼala dịka nwantakịrị a mụkworo amụkwo, dịka nwa ọhụrụ nke na-ahụghị ìhè nke ụbọchị anya?
17Nʼebe ahụ ka ndị na-emebi iwu na-akwụsị iweta ọgbaaghara, nʼebe ahụ ka ndị ike gwụrụ na-ezu ike.
18Ebe ahụ ka ndị nọ nʼagbụ na-enwere onwe ha, ha adịghị anụkwa ịba mba nke ndị na-eji aka ike achị ha.
19Ebe ahụ ka ndị ukwu na ndị nta nọ; ebe ahụ kwa ka ohu na-enwere onwe ya kpamkpam site nʼaka onye nwe ya.