19Ebe ahụ ka ndị ukwu na ndị nta nọ; ebe ahụ kwa ka ohu na-enwere onwe ya kpamkpam site nʼaka onye nwe ya.
20“Nʼihi gịnị ka e ji enye ndị nọ nʼọnọdụ nhụju anya ìhè? Gịnị bụ uru ndụ nye onye mkpụrụobi ya jupụtara nʼihe ilu?
21Gịnị bụ uru ya nye ndị na-echere ọnwụ ma ọ dịghị abịa, ee, ndị na-achọsi ọnwụ ike karịa akụ e zoro ezo,
22ndị jupụtara nʼọṅụ, na-aṅụrị ọṅụ mgbe ha rịdaruru nʼili?
23Gịnị mere e ji enye mmadụ ndụ; bụ onye ahụ ụzọ ya zoro ezo, onye Chineke mechibidoro ụzọ?