21Gịnị bụ uru ya nye ndị na-echere ọnwụ ma ọ dịghị abịa, ee, ndị na-achọsi ọnwụ ike karịa akụ e zoro ezo,
22ndị jupụtara nʼọṅụ, na-aṅụrị ọṅụ mgbe ha rịdaruru nʼili?
23Gịnị mere e ji enye mmadụ ndụ; bụ onye ahụ ụzọ ya zoro ezo, onye Chineke mechibidoro ụzọ?
24Nʼihi na ịma ọsụ aghọọla ihe oriri m kwa ụbọchị; ịsụ ude m na-awụpụtakwa dịka mmiri.
25Ihe m tụrụ egwu ya abịakwasịla m, ihe m tụrụ ụjọ ya bụ ihe bịakwasịrị m.