Job 31

Nʼihi na, gịnị bụ oke mmadụ ketara nʼaka Chineke onye bi nʼelu; gịnị bụkwa ihe nketa ya site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile nọ nʼelu?

Job 31:2 (UKJV) For what portion of God is there from above? and what inheritance of the Almighty from on high?

1“Mụ na anya m gbara ndụ kpebie na o nweghị mgbe m ga-ele nwaagbọghọ ọbụla anya nʼihi agụụ ịkwa iko.

2Nʼihi na, gịnị bụ oke mmadụ ketara nʼaka Chineke onye bi nʼelu; gịnị bụkwa ihe nketa ya site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile nọ nʼelu?

3Ọ bụghị mbibi nye ndị ajọ omume, nhụju anya nye ndị na-eme ihe ọjọọ?

4Ọ bụ na ọ naghị ahụ ụzọ m niile, gụọkwa nzọ ukwu m niile ọnụ?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.