Job 31

Ọ bụ na ọ naghị ahụ ụzọ m niile, gụọkwa nzọ ukwu m niile ọnụ?

Job 31:4 (UKJV) Does not he see my ways, and count all my steps?

2Nʼihi na, gịnị bụ oke mmadụ ketara nʼaka Chineke onye bi nʼelu; gịnị bụkwa ihe nketa ya site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile nọ nʼelu?

3Ọ bụghị mbibi nye ndị ajọ omume, nhụju anya nye ndị na-eme ihe ọjọọ?

4Ọ bụ na ọ naghị ahụ ụzọ m niile, gụọkwa nzọ ukwu m niile ọnụ?

5“Ọ bụrụ na m gara ije nʼụzọ ụgha maọbụ na ụkwụ m mere ngwangwa gbasoro ụzọ aghụghọ,

6ka Chineke were ihe ọtụtụ ziri ezi tụọ m, ọ ga-amata na m bụ onye na-enweghị ịta ụta.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.