4Ọ bụ na ọ naghị ahụ ụzọ m niile, gụọkwa nzọ ukwu m niile ọnụ?
5“Ọ bụrụ na m gara ije nʼụzọ ụgha maọbụ na ụkwụ m mere ngwangwa gbasoro ụzọ aghụghọ,
6ka Chineke were ihe ọtụtụ ziri ezi tụọ m, ọ ga-amata na m bụ onye na-enweghị ịta ụta.
7Ọ bụrụ na nzọ ụkwụ m si nʼụzọ wezuga onwe ya, ọ bụrụ anya m na-edu obi m, ma ọ bụkwanụ na aka m abụọ bụ ihe e merụrụ emerụ,
8ọ bụrụ otu a, ka onye ọzọ rie ihe m kụrụ nʼubi, ka e hopuchakwa ihe niile m kụrụ nʼubi.