26ọ bụrụ na m legidere anyanwụ anya nʼebube ya, maọbụ ọnwa nʼike nchawa ya,
27nke ga-eme ka obi m bụrụ ihe a rafuru na nzuzo, maọbụ aka m abụrụ ihe e weliri ife ha ofufe,
28mgbe ahụ, ihe ndị a ga-abụ mmehie nke a ga-ekpe ikpe, nʼihi na m gaara abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke, Onye bi nʼelu.
29“Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọdachi nke dakwasịrị onye iro m maọbụ chịa ọchị nʼihi nsogbu nke dakwasịrị ya,
30ekwebeghị m ka ọnụ m mehie megide ha site nʼịbụ ndụ ha ọnụ.