28mgbe ahụ, ihe ndị a ga-abụ mmehie nke a ga-ekpe ikpe, nʼihi na m gaara abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke, Onye bi nʼelu.
29“Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọdachi nke dakwasịrị onye iro m maọbụ chịa ọchị nʼihi nsogbu nke dakwasịrị ya,
30ekwebeghị m ka ọnụ m mehie megide ha site nʼịbụ ndụ ha ọnụ.
31Ọ bụrụ na o nwebeghị oge ndị nọ nʼezinaụlọ m kwuru okwu sị. ‘Onye ka ọ bụ nke na-erijubeghị afọ site nʼihe oriri Job na-enye?’
32Ma ọ dịghị onye ọbịa na-anọ ọnọdụ abalị nʼama, nʼihi ụzọ m na-eghe oghe mgbe ọbụla nye ndị ije.