7Ọ bụrụ na nzọ ụkwụ m si nʼụzọ wezuga onwe ya, ọ bụrụ anya m na-edu obi m, ma ọ bụkwanụ na aka m abụọ bụ ihe e merụrụ emerụ,
8ọ bụrụ otu a, ka onye ọzọ rie ihe m kụrụ nʼubi, ka e hopuchakwa ihe niile m kụrụ nʼubi.
9“Ọ bụrụ na ọ gụọla obi m agụụ ijekwuru nwanyị ọzọ, maọbụ na m ezoola nʼọnụ ụzọ onye agbataobi m,
10mgbe ahụ, ka nwunye m kwọọrọ nwoke ọzọ nri, ka ndị ikom ọzọ dinaa ya.
11Nʼihi na nke ahụ ga-abụ ihe ihere, bụrụkwa mmehie kwesiri ka e kpee ya ikpe.