18Ọ bụghị ya na-agwa ndị eze okwu sị, ‘Unu abaghị uru,’ ma na-agwakwa ndị a mara aha ha sị, ‘Unu bụ ndị ajọ omume.’
19Onye na-adịghị ekpe ikpe mmegide nye ụmụ ndị ikom eze, onye na-adịghị emenyere ndị ọgaranya, ma megbuo ndị ogbenye, nʼihi na ha niile bụ ọrụ aka ya.
20Nʼotu ntabi anya, ha na-anwụ nʼime etiti abalị; ndị ahụ na-ama jijiji ma gabiga; a na-ewezugakwa ndị dị ike ma ọ bụghị site nʼaka mmadụ.
21“Anya ya na-elekwasị ụzọ niile nke ụmụ mmadụ; ọ na-ahụkwa nzọ ụkwụ ha niile.
22Ọ dịghị ọchịchịrị dị, ọ dịghịkwa oke ọchịchịrị dị, ebe ndị na-eme ajọ ihe pụrụ izo.