29Ma ọ bụrụ na ọ gba nkịtị, onye ga-ama ya ikpe? Ọ bụrụ na o zoo ihu ya, onye pụrụ ịhụ ya? Ma ya onwe ya na-achị isi nʼebe mmadụ na mba nọ,
30igbochi nwoke na-adịghị atụ egwu Chineke ịchị obodo, ka ọ gharakwa ịbụ ihe ọnya nye ndị mmadụ.
31“Ọ bụrụ na mmadụ a sị Chineke, ‘Abụ m onye ikpe mara ma agaghị m emehie kwa ọzọ.
32Biko, zi m ihe ndị ahụ m na-apụghị ịhụ; ọ bụrụ na m emehiela, agaghị m emekwa ya ọzọ.’
33Chineke ọ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ site na mkpebi gị mgbe ị jụrụ ichegharị? Gị onwe gị ga-ekpebi, ọ bụghị mụ; ya mere gwa m ihe ị mara.