21Lezie anya, ka i ghara iche ihu nye ajọ ihe, bụ nke ọ dị ka ị na-ahọrọ karịa mkpagbu.
22“E buliela Chineke elu nʼike ya, onye bụ onye ozizi dịka ya?
23Onye họpụtaara ya ụzọ ọ ga-agbaso, maọbụ sị ya ‘I meela ajọ ihe’?
24Cheta ka i bulie ọrụ aka ya elu, bụ nke ụmụ mmadụ torola site nʼabụ.
25Mmadụ niile ahụzuola ya; ụmụ mmadụ nọ nʼebe dị anya na-ele ya anya.