1Elihu gara nʼihu sị:
2“Nyetụ m nwa oge nta, ka m gosi gị na ọ ka dị ọtụtụ ihe e nwere ikwu nyere Chineke.
3Ana m enweta amamihe m site nʼebe dị anya; aga m enye Onye kere m ezi omume.
4Ya doo gị anya na okwu m abụghị okwu ụgha; onye zuruoke nʼihe ọmụma nọnyeere gị.
5“Chineke dị ike ma ọ dịghị eleda mmadụ ọbụla anya; ọ dị ike, bụrụkwa onye na-eme ihe ọbụla o zubere ime.