1“Nʼihi nke a, obi m na-ama jijiji, na-amali elu site nʼọnọdụ ya.
2Gee ntị! Gee ntị nụrụ ụda olu ya, na ụzụ nke si nʼọnụ ya apụta.
3Ọ na-atọpụ amụma ya ka ọ na-ejeru nʼokpuru eluigwe niile, ọ na-ezisakwa ya ebe niile ụwa sọtụrụ.
4Nke a gasịa, ihe ọzọ na-eso ya bụ mbigbọ nke olu ike ya; ụda olu ya na ada ụda dịka egbe eluigwe, mgbe olu ahụ dara dakwasị, ọ naghị egbochi amụma igbu egbu.