28Mmiri ozuzo o nwere nna? Onye mụrụ igirigi?
29Site nʼakpanwa onye ka mkpụrụ mmiri si apụta? Onye kwa bụ nne oke oyi nke eluigwe,
30nke na-eme ka mmiri kpụkọtaa dịrị ike dịka nkume, meekwa ka ihu ogbu mmiri kpụkọta?
31“Ị pụrụ ikechi agbụ niile nke Pleiades? Ị pụrụ ịtọpụ ihe nkechikọta Orion?
32Ị pụrụ ime ka igwe kpakpando pụta nʼoge ha maọbụ dupụta anụ ndọgbu Bịa na ụmụ ya ndị ọzọ?