2“Onye bụ onye a nke ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na ya na-eme ka atụmatụ m ghara ịpụta ìhè?
3Ugbu a, jikere onwe gị dịka dimkpa nʼihi na enwere m ajụjụ m ga-ajụ gị nke m chọrọ ka i nye m ọsịsa ha.
4“Ebee ka ị nọ mgbe m tọrọ ntọala ụwa? Gwa m ma ọ bụrụ na ị ghọtara.
5Onye kpebiri ihe ụwa ga-aha ka ya? Nʼezie ị maara, onye setịrị ihe ọtụtụ e ji tụọ ya nʼelu ya?
6Nʼelu gịnị ka a tọrọ ntọala ya, onye doro nkume mbụ e ji tọọ ntọala ya?