8“Ị ga-aga nʼihu ikwujọ ikpe ziri ezi m? Ị ga-aga nʼihu maa m ikpe ka ị si otu a bụrụ onye ikpe gaara?
9Ogwe aka gị ọ dị ike dịka nke Chineke? Olu gị ọ pụrụ ịda ụda dịka nke ya?
10Were ebube na ịdị ukwuu chọọ onwe gị mma, yikwasịkwa onwe gị nsọpụrụ na ugwu dịka uwe.
11Wụsa iwe gị dị ọkụ nʼebe ndị mpako niile nọ, weda ha nʼala,
12lekwasịkwa ndị mpako niile anya mee ha ihe ihere, ma tiriekwa ndị na-emebi iwu ebe ha guzo.