13Likọta ha niile nʼotu nʼaja, kpuchie ihu ha niile nʼala ili.
14Mgbe ahụ, mụ onwe m ga-ekwenyere gị, na aka nri nwere ike ịzọpụta gị.
15“Lee enyi mmiri anya, bụ nke m kere dịka m si kee gị, ma ihe ọ na-eri bụ ahịhịa dịka ehi.
16Lee ike dị nʼukwu ya, leekwa ike dị nʼime afọ ya.
17Ọdụdụ ya ka ọ na-efegharị dịka osisi sida; akwara dị ya nʼahụ ka e jikọtara nke ọma.