20Ugwu na-enye ya ihe ọ na-eri. Nʼebe ahụ kwa ka ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ na-anọ egwuri egwu.
21Ọ na-edina nʼokpuru ahịhịa na-eto nʼakụkụ mmiri, zookwa onwe ya nʼetiti ahịhịa riidi nʼapịtị.
22Ahịhịa lotus na-eji ndo ya kpuchie ya, osisi pọpla nke dị nʼakụkụ mmiri gbara ya gburugburu.
23Ọ bụladị mgbe ebili mmiri na-ama, ọ dịghị atụ egwu; ọ na-anọ nwayọọ, nʼagbanyeghị na mmiri Jọdan na-asọpụta na-asọju ya nʼọnụ.
24Onye pụrụ ijide ya mgbe ọ na-ele anya, maọbụ were ọnya jide ya mapuo ya imi?