14Onye pụrụ imeghe ụzọ nke ọnụ ya, nke eze dị oke egwu gbara gburugburu?
15Azụ ya nwere ọta ndị e doro nʼusoro nke e mechisịrị ike ka ha rapara nʼahụ ibe ha,
16nke ọbụla dị ibe ya nso, na ikuku enweghị ike gafee nʼetiti ha.
17E jikọtara ha ọnụ nke ọma, ha na-ejisi onwe ha ike, enweghị ike ikewa ha.
18Ìhè na-enwupụta mgbe ọbụla o zere uzere; anya ya abụọ na-achakwa dịka anwụ ụtụtụ.