13Onye nwere ike ikpughepụ ihe e ji kpuchie ya ahụ? Onye nwekwara ike ịbanye nʼagba ya apịajiri okpukpu abụọ?
14Onye pụrụ imeghe ụzọ nke ọnụ ya, nke eze dị oke egwu gbara gburugburu?
15Azụ ya nwere ọta ndị e doro nʼusoro nke e mechisịrị ike ka ha rapara nʼahụ ibe ha,
16nke ọbụla dị ibe ya nso, na ikuku enweghị ike gafee nʼetiti ha.
17E jikọtara ha ọnụ nke ọma, ha na-ejisi onwe ha ike, enweghị ike ikewa ha.