11Olee onye m ji ụgwọ nke m na-aghaghị ịkwụ? Ihe niile dị nʼokpuru eluigwe bụ nke m.
12“Agaghị m akwụsị ikwu ihe banyere ụkwụ na aka Leviatan, na ike ya, na ụdịdị ya mara mma.
13Onye nwere ike ikpughepụ ihe e ji kpuchie ya ahụ? Onye nwekwara ike ịbanye nʼagba ya apịajiri okpukpu abụọ?
14Onye pụrụ imeghe ụzọ nke ọnụ ya, nke eze dị oke egwu gbara gburugburu?
15Azụ ya nwere ọta ndị e doro nʼusoro nke e mechisịrị ike ka ha rapara nʼahụ ibe ha,