20Anwụrụ ọkụ na-esi nʼimi ya na-apụta, dịka ukuru ọkụ nke na-esi nʼime mmiri na-agbọ nʼelu osisi achara.
21Ume ọ na-ekupụta na-afụnwu ọkụ icheku. Ire ọkụ na-esitekwa nʼọnụ ya na-amapụ dịka àkụ.
22Ike nwere ọnọdụ nʼolu ya, obi ịlọ mmiri na-aga ya nʼihu.
23Akpụkpọ anụ ahụ ya bụ ihe jikọtara ọnụ nke ọma, ha siri ike na-apụghị inugharị ha.
24Obi ya dị ike dịka nkume, dịka nkume e ji akwọ ihe.