21Ume ọ na-ekupụta na-afụnwu ọkụ icheku. Ire ọkụ na-esitekwa nʼọnụ ya na-amapụ dịka àkụ.
22Ike nwere ọnọdụ nʼolu ya, obi ịlọ mmiri na-aga ya nʼihu.
23Akpụkpọ anụ ahụ ya bụ ihe jikọtara ọnụ nke ọma, ha siri ike na-apụghị inugharị ha.
24Obi ya dị ike dịka nkume, dịka nkume e ji akwọ ihe.
25Mgbe o bilitere ọtọ, ndị dike na-atụ oke ụjọ; ha na-alaghachi azụ nʼihi mmagharị ya.