24Obi ya dị ike dịka nkume, dịka nkume e ji akwọ ihe.
25Mgbe o bilitere ọtọ, ndị dike na-atụ oke ụjọ; ha na-alaghachi azụ nʼihi mmagharị ya.
26O nweghị mma agha ọbụla pụrụ igbochi ya, o nwekwaghị ùbe igwe, maọbụ àkụ maọbụ ihe ọbụla a pịrị ọnụ ya apị nke pụrụ igbochi ya.
27Nʼebe ọ nọ, igwe dị ka ahịhịa; bronz dịkwa ka osisi rere ure nʼebe ọ nọ.
28Àkụ adịghị eme ka ọ gbalaga, ịtụ ya nkume dị ka ịtụ ya igbugbo ọka.