4Ọ ga-ekwe ka gị na ya baa nʼọgbụgba ndụ ka i were ya dịka ohu gị ogologo ndụ ya niile?
5Ị ga-eji ya gwurie egwu dịka nnụnụ? Maọbụ kee ya eriri nye ya ụmụ agbọghọ nọ nʼụlọ gị?
6Ndị ahịa ha ga-eji ya zụọ ahịa? Ha ga-eke ya nʼetiti ndị mgbereahịa?
7Ị pụrụ iji igwe nko mejuo akpụkpọ ahụ ya maọbụ iji ùbe ndị ọkụ azụ dupuo isi ya?
8Ọ bụrụ na ị tụkwasị ya aka, ị gaghị echefu ọgụ ọ ga-alụso gị. Ị gakwaghị anwa ya ọzọ.