3Ọ ga-arịọ gị arịrịọ ka i meere ya ebere? Ọ ga-eji olu dị nro gwa gị okwu?
4Ọ ga-ekwe ka gị na ya baa nʼọgbụgba ndụ ka i were ya dịka ohu gị ogologo ndụ ya niile?
5Ị ga-eji ya gwurie egwu dịka nnụnụ? Maọbụ kee ya eriri nye ya ụmụ agbọghọ nọ nʼụlọ gị?
6Ndị ahịa ha ga-eji ya zụọ ahịa? Ha ga-eke ya nʼetiti ndị mgbereahịa?
7Ị pụrụ iji igwe nko mejuo akpụkpọ ahụ ya maọbụ iji ùbe ndị ọkụ azụ dupuo isi ya?