1“Ị pụrụ iji nko azụ jide Leviatan maọbụ jiri ụdọ kegide ire ya bịada ya?
2Ị pụrụ ikenye eriri nʼimi ya maọbụ were ngu igwe mapuo agba ya?
3Ọ ga-arịọ gị arịrịọ ka i meere ya ebere? Ọ ga-eji olu dị nro gwa gị okwu?
4Ọ ga-ekwe ka gị na ya baa nʼọgbụgba ndụ ka i were ya dịka ohu gị ogologo ndụ ya niile?
5Ị ga-eji ya gwurie egwu dịka nnụnụ? Maọbụ kee ya eriri nye ya ụmụ agbọghọ nọ nʼụlọ gị?