7Ị pụrụ iji igwe nko mejuo akpụkpọ ahụ ya maọbụ iji ùbe ndị ọkụ azụ dupuo isi ya?
8Ọ bụrụ na ị tụkwasị ya aka, ị gaghị echefu ọgụ ọ ga-alụso gị. Ị gakwaghị anwa ya ọzọ.
9Ọ bụ ime ihe nzuzu bụ mmadụ ịgbalị ijide ya. Naanị ilekwasị ya anya na-eyi egwu.
10Nʼihi nke a, o nweghị onye nwere obi ike ịkpasu ya iwe. Ọ bụ onye pụrụ iguzogide m?
11Olee onye m ji ụgwọ nke m na-aghaghị ịkwụ? Ihe niile dị nʼokpuru eluigwe bụ nke m.