1Mgbe ahụ, Job zara Onyenwe anyị sị:
2“Amara m na ị pụrụ ime ihe niile; ọ dịghị atụmatụ gị nke a pụrụ ikposa.
3Ị jụrụ sị, ‘Onye bụ onye nke a ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na ya na-eme ka atụmatụ m ghara ịpụta ihe?’ Nʼezie, ekwuru m banyere ihe ndị m na-aghọtaghị, ihe ndị dị oke ebube karịa m ịmata.