14Ndị a bụ aha ụmụ ya ndị inyom: nke mbụ bụ Jimaịma, nke abụọ bụ Kezaya, ebe nke atọ bụ Kerin-Hapuk.
15Nʼala ahụ niile, o nweghị ụmụ agbọghọ mara mma dịka ụmụ ndị inyom Job ndị a. Job mekwara ka ha bụrụ ndị ga-eso ụmụ ya ndị ikom keta oke nʼihe niile o nwere.
16Job nọgidekwara ndụ narị afọ na iri afọ anọ ọzọ. Ọ hụrụ ụmụ ya, na ụmụ ha ruo ọgbọ nke anọ.
17Job nwụrụ mgbe o mere ezigbo agadi, ụbọchị ndụ ya jukwara ya afọ.