Job 42

Ndị a bụ aha ụmụ ya ndị inyom: nke mbụ bụ Jimaịma, nke abụọ bụ Kezaya, ebe nke atọ bụ Kerin-Hapuk.

Job 42:14 (UKJV) And he called the name of the first, Jemima; and the name of the second, Kezia; and the name of the third, Kerenhappuch.

12Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gọziri Job nʼoge ikpeazụ nke ndụ ya karịa ka o si gọzie ya na mbụ. Job nwere puku atụrụ iri na anọ na puku ịnyịnya kamel isii na puku ehi abụọ na otu puku ịnyịnya ibu.

13Chineke mekwara ka ọ mụta ụmụ ndị ikom asaa, na ụmụ ndị inyom atọ ọzọ.

14Ndị a bụ aha ụmụ ya ndị inyom: nke mbụ bụ Jimaịma, nke abụọ bụ Kezaya, ebe nke atọ bụ Kerin-Hapuk.

15Nʼala ahụ niile, o nweghị ụmụ agbọghọ mara mma dịka ụmụ ndị inyom Job ndị a. Job mekwara ka ha bụrụ ndị ga-eso ụmụ ya ndị ikom keta oke nʼihe niile o nwere.

16Job nọgidekwara ndụ narị afọ na iri afọ anọ ọzọ. Ọ hụrụ ụmụ ya, na ụmụ ha ruo ọgbọ nke anọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.