Job 42

Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gọziri Job nʼoge ikpeazụ nke ndụ ya karịa ka o si gọzie ya na mbụ. Job nwere puku atụrụ iri na anọ na puku ịnyịnya kamel isii na puku ehi abụọ na otu puku ịnyịnya ibu.

Job 42:12 (UKJV) So the LORD blessed the latter end of Job more than his beginning: for he had fourteen thousand sheep, and six thousand camels, and a thousand yoke of oxen, and a thousand she asses.

10Mgbe Job kpesịrị ekpere maka ndị enyi ya, Onyenwe anyị mekwara ka ọ baa ụba ọzọ. O nyekwara ya okpukpo abụọ nke ihe niile o nwere na mbụ.

11Mgbe ahụ, ụmụnne ya ndị ikom na ụmụnne ya ndị inyom, na ndị enyi ya niile bịara soro ya rie oriri nʼụlọ ya, na-akasị ya obi nʼihi iru ụjụ ya niile. Ha kasịkwara ya obi nʼihi ọnwụnwa niile Onyenwe anyị mere ka ọ bịakwasị ya. Ha niile nʼotu nʼotu nyere ya onyinye ọlaọcha na mgbaaka ọlaedo.

12Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gọziri Job nʼoge ikpeazụ nke ndụ ya karịa ka o si gọzie ya na mbụ. Job nwere puku atụrụ iri na anọ na puku ịnyịnya kamel isii na puku ehi abụọ na otu puku ịnyịnya ibu.

13Chineke mekwara ka ọ mụta ụmụ ndị ikom asaa, na ụmụ ndị inyom atọ ọzọ.

14Ndị a bụ aha ụmụ ya ndị inyom: nke mbụ bụ Jimaịma, nke abụọ bụ Kezaya, ebe nke atọ bụ Kerin-Hapuk.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.