3Ị jụrụ sị, ‘Onye bụ onye nke a ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na ya na-eme ka atụmatụ m ghara ịpụta ihe?’ Nʼezie, ekwuru m banyere ihe ndị m na-aghọtaghị, ihe ndị dị oke ebube karịa m ịmata.
4“Ị sịrị, ‘Gee ntị ugbu a, aga m ekwu okwu; m ga-ajụ gị ajụjụ, gị onwe gị ga-azakwa m.’
5Ntị m nụrụ ihe banyere gị ma ugbu a, ejirila m anya abụọ hụ gị.
6Ya mere, ana m akpọ onwe m asị, na echegharịkwa nʼime ntụ na uzuzu.”
7Mgbe Onyenwe anyị gwasịrị Job okwu, ọ tụgharịrị gwa Elifaz onye Teman okwu sị ya, “Ana m ewesa gị na ndị enyi gị abụọ iwe, nʼihi na ihe unu kwuru banyere m ezighị ezi dịka nke ohu m Job kwuru.