5Ntị m nụrụ ihe banyere gị ma ugbu a, ejirila m anya abụọ hụ gị.
6Ya mere, ana m akpọ onwe m asị, na echegharịkwa nʼime ntụ na uzuzu.”
7Mgbe Onyenwe anyị gwasịrị Job okwu, ọ tụgharịrị gwa Elifaz onye Teman okwu sị ya, “Ana m ewesa gị na ndị enyi gị abụọ iwe, nʼihi na ihe unu kwuru banyere m ezighị ezi dịka nke ohu m Job kwuru.
8Ugbu a, werenụ oke ehi asaa na ebule asaa, jekwuru ohu m bụ Job ka o jiri ha chụọrọ unu aja nsure ọkụ, ohu m bụ Job ga-ekpekwara unu ekpere. Aga m anabatakwa ekpere ọ ga-ekpe nʼihi unu. Agaghị m alakwa unu nʼiyi nʼihi okwu nzuzu unu. Unu ekwughị ihe ziri ezi banyere m dịka ohu m Job si kwuo.”
9Ya mere, Elifaz onye Teman, na Bildad, onye Shu, na Zofa, onye Naaman mere dịka Onyenwe anyị si nye ha nʼiwu. Onyenwe anyị nabatakwara ekpere nke Job kpere nʼihi ndị enyi ya.