1Mgbe ahụ, Job zara sị:
2“A sịkwarị na a pụrụ ịtụ ihe mgbu m ya na nhụju anya m niile nʼelu nʼihe ọtụtụ!
3Ọ ghaghị ịdị arọ karịa aja dị nʼọnụ mmiri ọtụtụ osimiri, nke mere okwu m ji ada ike ike.
4Àkụ Onye pụrụ ime ihe niile gbara dị nʼime m; mmụọ m na-aṅụkwa nsi dị na ha; ihe egwu Chineke edoola onwe ha nʼusoro imegide m.