10Ọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube nke mmadụ na-enweghị ike ịghọta, ihe ịrịbama nke ọnụ na-enweghị ike ịgụta.
11Mgbe ọ na-esi nʼakụkụ m agafe, enweghị m ike ịhụ ya, mgbe ọ na-agabiga, adịghị m amata na ọ bụ ya.
12Ọ bụrụ na ọ pụnara ihe, onye na-akwụsị ya? Onye kwa pụrụ ịjụ ya si, ‘Gịnị ka ị na-eme?’
13Chineke adịghị eme ka iwe ya laghachi, ọbụladị ndị inyeaka Rehab, ruru ala nʼụkwụ ya.
14“Onye kwanụ ka m bụ, m ga-eji nwee ike iguzo nʼihu ya ịjụ ya ajụjụ, maọbụ mụ na ya ịrụrịta ụka?