12Ọ bụrụ na ọ pụnara ihe, onye na-akwụsị ya? Onye kwa pụrụ ịjụ ya si, ‘Gịnị ka ị na-eme?’
13Chineke adịghị eme ka iwe ya laghachi, ọbụladị ndị inyeaka Rehab, ruru ala nʼụkwụ ya.
14“Onye kwanụ ka m bụ, m ga-eji nwee ike iguzo nʼihu ya ịjụ ya ajụjụ, maọbụ mụ na ya ịrụrịta ụka?
15Nʼagbanyeghị na aka m dị ọcha, apụghị m ịsa ya okwu; kama m ga-arịọ onye ikpe m ka o mere m ebere.
16A sịkwarị na m kpọọ ya oku, ọ za m, ekwenyeghị m na ọ ga-ege m ntị.