14“Onye kwanụ ka m bụ, m ga-eji nwee ike iguzo nʼihu ya ịjụ ya ajụjụ, maọbụ mụ na ya ịrụrịta ụka?
15Nʼagbanyeghị na aka m dị ọcha, apụghị m ịsa ya okwu; kama m ga-arịọ onye ikpe m ka o mere m ebere.
16A sịkwarị na m kpọọ ya oku, ọ za m, ekwenyeghị m na ọ ga-ege m ntị.
17Ọ ga-eji oke ifufe tirie m, meekwa ka ihe mgbu m baa ụba na-enweghị ihe butere ya.
18Ọ gaghị ekwe ka iku ume m lọghachi kama ọ ga-eji iru ụjụ kpuchie m.