16A sịkwarị na m kpọọ ya oku, ọ za m, ekwenyeghị m na ọ ga-ege m ntị.
17Ọ ga-eji oke ifufe tirie m, meekwa ka ihe mgbu m baa ụba na-enweghị ihe butere ya.
18Ọ gaghị ekwe ka iku ume m lọghachi kama ọ ga-eji iru ụjụ kpuchie m.
19Ọ bụrụ ihe e ji ike eme, lee na ọ dị ike nke ukwuu! Ọzọ ọ bụrụ nʼikpe ziri ezi, onye pụrụ iguzogide ya.
20A sịkwarị na aka m dị ọcha, ọnụ m ga-ama m ikpe; ọ bụrụ na abụ m onye na-enweghị ịta ụta, ọ ga-agụ m nʼonye ikpe mara.